Triumph Times

Akụkọ ifo: Nnụ ego na iri.

African Stories Akuko Ifo Igbo

Mazi Ndụka bụ nwoke tolo ogologo nke ukwuu ma dịkwa oji, ọ maghị mma ihu. Naanị ogologo ya mere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ji abịa ya nso. Ọ bụghị ụmụ nwaanyị niile ọ chọrọ ka ọ na-enweta, ụfọdụ sịrị na ha chọrọ nwoke dị ọcha, ebe ụfọdụ sịrị na ha achọghị nwoke tolo ogologo nke ukwuu.

Ndụka bụ onye iwe ọkụ nke bụ na ọ ga-agwa gị na ya ga-egbu gị gbuo onwe ya ma gị na ya sewe okwu maọbụ rụwa ụka.

Mbiri bụ nna Ndụka, ọ dị afọ iri asatọ na abụọ (82). Ọrụ ya bụ ịgba “mkpọnanị” ma mmadụ nwụọ maọbụ n’ ememme (Festival) iri ji ọhụrụ. Ọ lụọla ya bụ ọrụ ọtụtụ afọ bido na mgbe ọ ka bụ okorobịa.

N’ oge gara aga, ezinụlọ Ezeụdụ bụ ihe eji eme ọchị. Ezeụdụ bụ dinta, ihe mere aha ya jiri wuo ewuo bụ na o gburu agụ. Ọ naghị akpọ nkịta eje nta, mere ndị mmadụ ji akpọ ya “Agụ Enwe Oyi” O kwuru na “ọ bụghị akupe ga-agbara Ikegwụọnụ mgbada.

Ezeụdụ na-agbata anụ ọbụla gara fịam n’anya ya, O nwere ihe niile mana ọ naghị enwe obi aṅụrị n’ihi na ọ lụọla ọtụtụ nwaanyị ma o nweghị ike ịmụta nwoke. Naanị otu nwanyị ka nwunye nke asatọ mụtaara ya, ndị ọzọ amụtaghị nnwa.

Aha nwa ya nwaanyị bụ Nnụ ego, Ezeụdụ kpebiri na ya ga-ahachi Nnụ ego n’ihi na ọ chọghị ka aha ya kpochapụ. Ọ chọrọ onye ga-amụtara ya nwoke mere o ji hachie Nnụ ego.

Ọtụtụ ụmụ nwoke bịara ịlụ Nnụ ego mana Ezeụdụ jụrụ ajụ jụwa isi. Ọchị a na-achị Ezeụdụ bụ maka na o nweghị nwa nwoke, o kpebiri na aha ọ ga-agụ nwa nwoke ọbụla Nnụ ego ga-amụta bụ “Ọnụ Ụwa”

Nnụ ego eyighị nna ya. ịhụ ya, ị ga-asị na o nwere ike yie ndị ikwu nne ya n’ ihi na o yighị nne ya chaa.

Ezeụdụ ekweghị nwoke ọbụla metụ Nnụ ego aka. Ọ sịrị na ọ ga-atọ ntị n’ala, ma sachaa anya ya ije wee họrọ nwoke ga atụwala Nnụ ego ime. Nnụ ego wee dịka osisi kwụ n’obi eze, o nweghị onye na-emetụ ya aka. Ọtụtụ oge, ọ na-amalite mewe ngalaba sị na nna ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu.

Ụbọchị oge a kara aka ruru, Mazi Ndụka were mabata ka mgbada n’ime ngwuru be Ezeụdụ. Ezeụdụ minyere anụ nchi n’ọkụ, mmanya ngwọ na ofe onugbu dịkwa. Ezeụdụ kwadoro akwado iji mee ka Ndụka nwee ike ọrụ n’ụbọchị ahụ.

Nnụ ego dị ihe dịka afọ iri na itoolu (19) ma ọ mabeghị ihe bụ mmekọahụ. Ezeụdụ mere ka Nnụ ego chuo mmiri n’ụbọchị ahụ iji mee ka ahụ ya mepetu obere. Ọ kọwaala ya ihe ga-eme ụbọchị ahụ. N’agbanyeghị na Nnụ ego aghọtachaghị ihe nna ya kọọrọ ya, o kwenyere n’ihi na ọ tụkwasịrị nna ya obi

Mbiri na Ezeụdụ kwekọrịtara na ọ bụrụ na Nnụ ego amụta nwoke ọ bụrụ nke Ezeụdụ, ọ mụta nwaanyị, Mbiri na Ndụka ewere.

N’ime mgbede mgbe Nnụ ego sachaala ahụ, ma sorokwa rie nri, ya bụ okwu a kara aka wee malite. Igbo sị “Okwu a kara aka bụ isi ka eji ekwe ya”. Nnụ ego malitere mebe ihe ọbụla nna ya gwara ya ka ebe dọkịta oyibo na apị ihe onyoonyoo. Mazi Ndụka were na-achị ka nwata tụtara kobo.

Ka ya bụ egwu malitere, Nnụ ego tiri mkpu ákwá si “Nna m, ọ na-ata m ata”, ma Ndụka gbadosiri ya ike n’ala ka e si agbado ewi mipụtara isi n’ọnụ. “Nwee ndidi nwa m” Ezeụdụ zaghachiri ya.

Mgbe Ndụka tiri mkpu nke ya ka Ezeụdụ maara na ya bụ egwu ebigo. Nnụ ego nọ n’ákwà, Ndụka nọ n’ọchị.

Ka ụbọchị nke abụọ gasịrị, ahụ na-ama Nnụ ego kparịkparị mgbe ọbụla Mazi Ndụka bịara be ha. Oge ụfọdụ ọ na-agwa nna ya na ya chọrọ ịga hụ Ndụka.

Ka ọnwa itoolu gasịrị, Nnụ ego mụrụ nwata nwaanyị di ezigbo ọcha, nne ya adịghị ọcha, Ndụka adịghị ọcha. Ọtụtụ si na nwa yiri ndị ikwu nne-nne ya. Obi gbajọrọ Ezeụdụ n’ihi na ọ bụghị nwoke ọ chọrọ ka Nnụ ego mụrụ.

Nsogbu dapụtara mgbe Mbiri bịara maka nwata nwaanyị Nnụ ego mụrụ. Nnụ ego amaghị ihe nna ya na Mbiri kpebiri makana nna ya agwaghị ya. Nnụ ego kwesịrị iso Ndụka laa wee zụlite nwa ya.

Nnụ ego kwara ákwá arịrị nke na nna ya malitere jụwa onwe ya ihe ọ ga-eme. N’ikpeazụ o kpebiri na Nnụ ego agaghị eso Ndụka laa. Ndụka gwara Ezeụdụ na ya agaghị adị ndụ nwoke ibe ya anapụ ya nwa ya nwaanyị. Nnụ ego nọ n’ákwà oge niile, o chọghị ịhapụ nna ya.

Ka ụbọchị atọ gasịrị, Ndụka kpebiri na ya ga-egbu Nnụ ego, ma gbuokwa onwe ya. Iwe wee Ndụka, ọ na-eme ihe bịara ya n’obi ozigbo.

Ọ bụ ụbọchị eke, mgbe Ezeụdụ gawara ịchụ nta ka ebenebe gburu. Ezeụdụ dị afọ iri asaa na asatọ mana ọ ka bụ ochie dike n’ịchụ nta. Ndị Igbo si na “Agadi nwaanyị anaghị aka nka n’egwu ọ maala agba”

Mkpu bidoro na-ada n’ụlọ Ezeụdụ, mana tupu Ezeụdụ anata, Nnụ ego bụzị ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Ndụka ejirigo mma sụpịasịa Nnụ ego ma gbuo onwe ya. Tupu Nnụ ego anwụrụ, ọ gwara nna ya na aha nwa ya bụ iri, “Iri, iri, iri”

Ezeụdụ akago nka mana o kpebiri na ya ga-akpọnye Mbiri Iri ma were obi afọ chere ọnwụ ya.

Bido ụbọchị ahụ gawa, Ezeụdụ malitere ire anụ ọbụla ọ gbatara n’nta “nnụ ego na iri” (Sixty naira) iji cheta nwa ya (Nnụ ego) na nwa nnwa ya (Iri).

Gwa anyị ihe mmụta dị n’akụkọ a

I Nwere akụkọ? Ngwa kọọrọ anyị ka obi dị anyị ụtọ

Related posts

Triumph Times brings to you all breaking news across the world.

This website uses cookies to improve your experience. We'll assume you're ok with this, but you can opt-out if you wish. Accept Read More

Skip to content